One Word for Our Bishop


 

https://m.facebook.com/story.php?story_fbid=pfbid02j4MZaaAEc6PFrCyW9ppxNhvgWR2Rvfsodci54XdrhK6XjG7LTRgaFzGfjDzcsuNAl&id=100061454784308&mibextid=Nif5oz



(TELL ABAKALIKI BISHOP THAT HE WHO LIVES WITHOUT DISCIPLINE DIES WITHOUT HONOUR)


Asị na ọ na- abụ nwanyị sisia OGIRI ọracharụ/o detụ na ire.

Makana etere ụgba etere OGIRI ihe ama bụ ofe.

Mana nwanyi na eke OGIRI mara ijiji anya- mkpọ.

          ===Okwu Igbo=== 


Ekebe OGIRI ma-ahụghị ijiji marakwa na ọ bụ OGIRI mmụọ.

Mana OGIRI sigburu ijiji na isi` adịghịkwa mma oriri.


E soro ihe OGIRI na esi na isi` agaghịkwa  eri ya eri.

Mana isi` OGIRI ekweghi ka amata  isi` ahụrụ nwanyị na eke OGIRI 


OGIRI-okpei na OGIRI Igbo abụghịkwa otu ihe na-agbanyeghi na ha abụọ bụ OGIRI OGIRI.


Ihe arụ/ahụ nwoke na esi bụ mmanya,arụ na-esi OGIRI bụ nwanyị nwe ya.


Ma chetakwa na:nwanyi na eke OGIRI na ijiji anaghị adị na iro.

Otigbue ijiji ọdaba na OGIRI .Ijiji ebeghi kwanụ na OGIRI, ọ dị ka ọbụghị OGIRI ka o kere.


Ekpere m taata bụ:

CHINEKE!

Ọkwa etu o siri bụrụ na nwanyị na-eke OGIRI mara ijiji anya-mkpọ ka o siri bụrụ na gị bụ CHI kere anyị mara akara aka anyị na otu na otu.

Biko tọghepụ ya bụ akara aka etu esi atọghepụ ngwugwu OGIRI ka osie.


OKIKE kere ụwa!

Anyị sịrị ka ya bụ "isi`" akara aka bụrụ nke gana esisasị ka OGIRI,sirue na oru na Igbo ma sitere anyị mbulielu,mmepe ụzọ,akụnaụba,di,nwunye,w.d.g.

Etu isi` OGIRI ahaziri nke ọma si eme ka ijiji si na oru na Igbo feta na OGIRI ma gba akaebe na ya bụ OGIRI dị mma iji tee ezigbote ofe onugbu/ọra bụ sọọ ụtọ


©Mazi Damian Okafor

(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments

Popular posts from this blog

Tomato now produced in large quantity in Igbo land

Beyond Politics Hon Kemkamma Kama has taken OHANIVO to enviable height