Okorie Jideofor; The most humble and intelligent youthful leader in
https://m.facebook.com/story.php?story_fbid=pfbid02o8nrSEQPyAPQwQ3pUntet3p5u13epsFn8QbGMak3i4SvpzeKpdffZAqGj1Dzx2fvl&id=100061454784308&mibextid=Nif5oz
(Umuigbo sorom kele O' Money, SSA to Ebonyi Governor of Solid Mineral)
=============================
Asị na anụ nwere mpi anaghị ezo na ọnụ.
Anaghị kwa ekpudo afọ ime aka.
Ya mere na afọ tụta ime,otube/utube agba ama.
O were bụrụ maka ezi ọkwụ aka m: Jideofor Okorie O' Money bụ onye nke m Siri ka m butere ozi ekele taata.
Ka mụ na agba ama ya.
Oke Efi na Ala Ikwo
Onye Ọcha bịara ụwa na oji.
Nwoke mara nma ka nwanyị.
Oke Nkịta ji isi anya ọkụ.
Mbazụ eji abụ mgbọrọgwụ na ajọ ọhịa.
Anụka ifufe.
Golibe!
Taata bụ ụbọchị gị.
Ma bụrụ kwa ụbọchị akara aka.
Makana ọbụ ụbọchị ndị nwe mgba ka ha nwe mba ọgụ.
Agha akara aka anaghị eri ngwọrọ.
Ya mere na emume taata adaghị gị na mberede.
I zuru ka eme.
Bịa rie abụghị bịa rụọ.
Ezi Ọyị
Ekpere m na isi taata bụ:
Ka CHINEKE yibe gị ogologo ndụ ka akwa`.
Ma waba gị arụ ike ka ọgọdọ.
Ka OkIKE kere ụwa:boo gị ibu arọ na ego.
Makana uru anaghị anyị arọ.
Ka ihe akụ akụ na ihe enwe enwe na ehu/eru ka Ohimmiri na ndụ gị.
Onye ji gị amụ ije,ga adarịrị ngwọrọ.
Ụkwụ na achụ gị nwe ada.
Ụkwụ ị na achụ nwe ada.
© Mazi Damian Okafor
(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)
Comments
Post a Comment