Ndi Ocho mma
https://m.facebook.com/story.php?story_fbid=pfbid02xmx7K1QPnBY49XmSmEkGKpc6DuXBzecs5STB6scmFVzjBV2ouviHQG8iqedGbqjEl&id=100061454784308&mibextid=Nif5oz
Ọ kwa nwa Ebune-akọ ka nna ya jụrụ sị:ugboro olee ka ihe ga-eme gị,ị mara ihe?
Ọ zara ya sị:na ya bụ Ebune-akọ na-eji ihe mere onye ọzọ were amara ihe.
===Ụka bụ Ilu===
ỤMỤNNE M!
Nke a bụ eziokwu makana ọ bụ ebe ana enye nwa nwere nne ndụmọdụ ka nwa na-enweghi nne na-anọ amụta ihe.
O were bụrụ maka JAY BOOGIE nọọ na eserese anyị bụ onye nke gara kegharịa onwe ya sitee na ị bụ nwoke chi kere ya were ghọzịa nwanyị.
Ugbu a ọ nọzie na-akwa ọrịa makana otu ihe etinyere ya na otule ka o were buo ibu ka nke nwanyị bụ nke bekee kpọrọ "silicone" agbawara ma na enye ya nnukwu nsogbu.
Ka-aka na-ekwu nke a na otule ya na-erezi uru,nke bụ nnukwu ọrịa dakwasị ya bụ ọrịa akụrụ(kidney faliure).
Ihe JAY na-ekwuzi ugbu a bụ na ya achọghịzị ị bụ nwanyị ọzọ.Na ị laghachi azụ na nwoke ka ya mma.
Eziokwụ!
Ọnọdụ ya na arịrị ọ na-ebe na emetụ m na obi.Mana egbubisịa biakwa kechibe,ọnaghịzi ezu oke. Ọ kwa isi kota Ebu;ọgba ya.Onye kpara nkụ ahụhụ/arụrụ sịrị Ngwere bịara ya olili.
Gị onwe gị na-agụ ihe a ;ọ kwa i soghi na ndị Chi ha kere oji ha ga zụrụ ude were dịzịa ọcha karịa ndị ọcha.Lekwa gị lekwa ọrịa akụrụ.
Ude eji acha ọcha na enwe otu maọbụ abụọ ndịa:"Kojic Acid,Hydroquinone,Mecury"
Ihe ndị a adịghị mma na ahụ mmadụ. Ọ na-eme ka ndị na ete "ude ọcha" nwe ihe Oyibo kpọrọ "Nephrotic Syndrome" bụ nke na eweta ajọ ọrịa dịka ọrịa akụrụ maọbụ ọrịa arụ ire ure(skin cancer)
Ka onye ọbụna were obi ọcha nabata etu ọbụna CHINEKE siri kee ya.Nwoke na-añụ ọgwụ ike ka o were nwe akpụ obi maọbụ ka ihe o jiri bụrụ nwoke towanye ogologo;ọ kwa ọrịa ga egbu gị ka iji ego gị azụrụ.
Ntị ga-anụ ihe abụghi kwanụ ma ọ raa/haa ka okpu ata makana otu okwu ezugoro nwa mara ihe.Ka ihe gburu nne nnụnụ gharakwa igbu nwa nnụnụ.
Udo na Ndụ dịrị gị
Ndewo!
© Mazi Damian Okafor
( Ohanaeze Ndigbo Youth Wing Leader Worldwide)
Comments
Post a Comment