Mazi Ekeh Augustine Ekeh bu odogwu na ebe Agu mbo
(Mazi Ekeh Augustine Ekeh bu odogwu na ebe Agu mbo)
Asịna ọ bụ osisi kara aka ka ana-elibe/ekedo nwa Ebunu-ỌKPỌ.
Maka nwa Ebunu bịa were ỌKPỌ.
Oti ỌKPỌ anaghị eti ogbe akwụ.
Makana onye isi nkwọcha anaghị aga ọgụ ana-eke ỌKPỌ.
Ọdịghịkwanụ mma ịrapụ ike nyụrụ ahụrụ ma bịa kebe isi ỌKPỌ.
Ma chetakwa na:anaghị eke mmụọ buu ụzọ ỌKPỌ.
Ekpere m taata bụ:
CHINEKE!
Ọkwa gị bụ oti ỌKPỌ nke ndụ anyị, biko bịa were ỌKPỌ tigbusịara anyị ihe niile na fụrụ anyị aka ỌKPỌ na ndụ anyị.Ka ha gharakwa iji ỌKPỌ were tigbue anyị.
OKIKE kere ụwa!
Were etu o siri bụrụ na ọ bụ na osisi kara aka ka-ana elibe nwa Ebunu ỌKPỌ were ngọzi na mbulielu kara aka were gbaa anyị ogige.
Ka nwa Ebunu bịa were ỌKPỌ nke ọnọdụ ọjọ ghara ịhụ ebe o siri tite anyị ỌKPỌ.
Makana anaghị eke mmụọ buu ụzọ ỌKPỌ.Ebe ọ bụ gị bụ OKIKE bụ nnukwu oti ỌKPỌ nakwa mmụọ buu ụzọ nke ndụ anyị.
Ya gazie!
Ndewo!
© Mazi Damian Okafor
(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments
Post a Comment