Igboke, The Most Supportive Commissioner


 

(Mazi (Engr) Igboke Felix Ogbonnia (MNSE FNATE), Nwoke Oma ;Nara ozi ekele m)


Asị na oke EHI/EFI gbapụ ọsọ,oke Mmadụ achụba ya ma jide ya.🐑

Ya mere na onye ana achụ EHI ebeku /akpọ okuu nwere ihe ọ na eme EHI

Mana ọ bụkwa nganga ka okenye ji agbara EHI ọsọ.

      


Anaghị ekechi EHI na-azọcha ọka ọnụ ya.

Anaghịkwa achọ isi EHI achọ na ite ofe

EHI na enweghị ọdụdụ,Chi ya na-achụrụ ya ijiji.


EHI na Enyi anaghị ama aka nke ka ibe ya ibu.

Ejighikwa mma egwusa EHI egwu ma ọ bụrụ na ị chọghị ịhụ nke EHI na eme.

Onye awọrọ anụ EHI sịrị na ọ bụ ọkpụkpụ ka ndị ketara anụ EHI ketara. 


Kama EHI m ga-agbanarị m , egbujiri m/ egbupu m  ya ọdụdụ ya.

EHI anaghị ezo na- ata.

Mmiri anaghị adị EHI mma na -anya.


Ma chetakwa na:Onye gburu EHI ma ghara ị nye ụmụnna ya anaghị aza OGBUEHI.


Ekpere m taata bụ:

CHINEKE biko ekwe kwana ka ọnọdụ ọjọ obodo anyị nọọ bụrụ nke ga-ama anyị bụ EHI mmiri na-anya.

Oloo!

Kama bụrụ anyị Chi na- achụrụ EHI na enweghị ọdụdụ ijiji.

Ka adịm mma anyị na gị bụrụ adịm mma Ụgbana na EHI. 


OKIKE kere ụwa:Etu o siri bụrụ na- anaghị achọ isi EHI achọ na ite ofe,biko ka- agharakwa ị chọọ ngọzi gị na nchekwaba gị achọ na ndụ anyị.

Makana onye ana achụ EHI ebeku nwere ihe ọ na eme EHI.

Ọkwa ọ na-abụ oke EHI gbapụ,oke mmadụ achụba ya ma jide ya?

Biko bịa jidere anyị EHI niile anyị na achụ ọsọ.

Ka ije elu ụwa mara anyị mma.


© Mazi Damian Okafor 

(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments

Popular posts from this blog

Tomato now produced in large quantity in Igbo land

Beyond Politics Hon Kemkamma Kama has taken OHANIVO to enviable height