IGBO YOUTH LEADER WROTE:



IGBO YOUTH LEADER WROTE:

Asị na ọnaghị abụ AJỤJỤ ajụghị ama agbaba.
Ọkwa onye ama agbapụghị,o buulu.
Ya mere onye na akọ m ọnụ ụwa,ị jụọra/jụọna Chi m AJỤJỤ.
        

Onye AJỤJỤ na ajụ:olee etu isi si awa ala?
Bịakwa hụrụ ebe ide´ na-awa ala.

Mkpi sịrị onye AJỤJỤ jụọrọ ya onye ji aka ekpe agba ya amụ;ọ bụ na ụdị nke mkparị ka ọ bụ na ụdị na ya dara ibi?
Onye AJỤJỤ na ajụ ma ọbụkwa Atanị nwe nwa ọkwọ na-azụ buru ụzọ lee Atanị anya na mkpụrụ anya ma lekwa nwa ọkwọ na-azụ anya na anya.

Onye AJỤJỤ anaghị efu ụzọ.
Ọ bụ ọ mara ajụ na ahụsịa ụgbọgụrụ bịakwa na ajụ nne ya ihe na amị añyụ.

Ma chetakwa na: Mbe sịrị na ọbụrụkwa na- aga egbu ya makana  ọ jụrụ AJỤJỤ;ka elikwa ozu ya na ụzọ ka AJỤJỤ were na ajụ" ọ bụ gịnị mere e jiri liee/niee ozu Mbe na ụzọ"  

Ekpere m taata bụ:
CHINEKE biko bịa sara anyị okwu ma zakwa anyị ekpere sitee na ị nye anyị ihe niile ahụ e jiri kọọ anyị ọnụ ụwa.
Ka AJỤJỤ "olee ebe CHI anyị nọọ?" laa na ndụ anyị.

OKIKE kere ụwa:asị na onye AJỤJỤ anaghị efu ụzọ.
AJỤJỤ anyị bụ ụmụ gị na ajụ gị bụ:olee mgbe ka ọnọdụ ọjọọ nkea juru ala anyị ga ebi?
Ihe isii ike,ị tọrọ mmadụ, ị kwafu ọbara na- arụ dị iche iche na -arịzi ibe ya elu ebe niile.

CHI anyị 
AJỤJỤ anyị na ajụ gị banyere ajọ ọnọdụ obodo anyị karịrị akarị.
Mana ọbụghị na anyị bidoro na ụtụtụ jụba gị AJỤJỤ were rue na abalị bụ na AJỤJỤ akwụsị.
Mba!
Ihe ga atụnye AJỤJỤ anyị niile ọnụ bụ ebere gị na ime ka ọnọdụ ọjọọ gbanwe ma ghọrọ anyị ọnọdụ ọma.
Ka AJỤJỤ dajụọ.

© Mazi Damian Okafor 
(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)


 

Comments

Popular posts from this blog

Ezza is the oldest clan in Igbo Land

Dr GOC and His Love for humanity