Ezigbo Onye Nkwado Her Excellency Mrs Nwifuru
(Hon. Nkechinyere Princess Iyioku Ezeani ; Hon. Commissioner for Agriculture Ebonyi State)
Asịna IJELE na mmanwụ ọzọ anaghị agba na ọgbọ.
Makana ihe nkiri anaghị akarị ikiri mmanwụ IJELE
O were bụrụ maka IJELE nwanyị na etinye Onu n'ihe ana n'ubochi taa.
Asa mma !
Ị bụgodụ ỌDỊ ỤKỌ NA MBA!
Nwa bulu ebu ma nwe "ngabasị"!
Anyanwụ ụtụtụ!
Ekee na Egwurugwu!
Etu i sii dị ọcha ka obi gi sikwara dị ọcha nyere mmadụ ibe gị.
Ihe ị na-acha na ọcha ka omume gị na-achakwa na ọcha.
Ọkwa ya ka e ji akpọ gị ONYE ỌCHA BỊARA ỤWA NA OJI.
Echiche obi gị mgbe niile na abụ ka Ụgbọgụrụ mịara gị ma mikwara nwunye dị gị.
Makana ihe na-agụ nwanyị di ime na agụkwa di tụbara ya ime
E mere nwa Ogugu sị mekwara nwa Anọsieike.
Makana adịghị ka ibe na-agụ ibe akwa.
Ọkwa ụmụnna nwezuo akụ,nsi na aja ala.
Anyanwụ ụtụtụ!
Igirigi Ehihie !
Kpakpando Abali !
Ọji Ugo dị na nkata ọji Eze!
Akwa Ugo dị na akwụ Ugo!
Iru Ugo na enye Ugo añụrị !
Mmasinachi na Onwe ya!
Asa mpete na-ebu ụzọ egwu!
Ekpere m na isi gị taata bụ na:
Ihe ị ga-abụrụ ndị na e chere gị ajọ ihe bụ oke osisi toro na-etiti oke ohimmiri.Ndi elu akpa nkụ.Ndị ala abụta mkpọrọgụ.Ya bụ ezigbote ọnọ nso eru aka.
Ka ị chakee ka Ugo na ihe akụakụ na ihe enwe enwe.
Makana gị bụ Ugo egbuzugo kwanụ.
Ọkwa Ugo gbuzuo ọchakee?
Ụkwa ị na-apịa bụ ihe mmetụaka gị ga-ejuputa rịrị na nkpụrụ
Makana ọ bụ onye rụọ orie.
Etu o sii abụ na mmiri ozuzo enweghi ike izo ma ala aghara ịgba akaebe na mmiri zoro ka OKIKE agaghị esi kee ogologo ndụ ma ndụ gị aghara ị gba akaebe na ndị ketara ogologo ndụ.
Etu o siri bụrụ na ubi agbara ogige na-aka ji ya.Ka CHUKWU ga-esi eji arụike gbaa ndụ ogige ma bụrụkwa aka ji arụike gị
ỤTỤ NDỊ Ugwulangwu!
ỤDARA NWANNU!
MMIMMI!
CHELEKU!
Ya gazie!
Ndewo
© Mazi Damian Okafor
(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)
Comments
Post a Comment