Congratulations To Mrs Nwifuru


 

Asị na -Akwa Ọkụkọ  tịwa akị ihere emebe OKWUTE/NKUME/MKPUME. 

Mana atụlie OKWUTE elu,egwu atụba ite.


Anaghị eji OKWUTE were elele/amata isi kara aka.

Ana-egosi nwata Awọ na OKWUTE ana-atụ ya aka ka o were mata ihe dị iche na Awọ na OKWUTE.

Onyeisi gwaba gị na ọ ga-atụwa gị isi ,mara na o nwere OKWUTE ọzọdoro ụkwụ.


Ma chetakwa na:ohi zuru OKWUTE eji eti akị agbaghị aka.Ọ bụrụ na ọbụghị ara ọwịwị ọ bụrụ agwụ na-akpa ya bụ onyeohi.


Ekpere m taata bụ:

Ka anyị were etu osi abụ na ọbụ nwata na-enye okenye akị o titere ka okenye na-azọtara OKWUTE eji eti akị;were na-enye CHINEKE ekele na ọnọdụ niile ka o were na-azọtara anyị okee anyị ma werekwa aka ya dị ike were OKWUTE tirisiara anyị ihe niile siri ike na ndụ anyị.


OKIKE kere ụwa!

Ekwekwana ka-anyị dị ka ọnụ akọrọ anyị.Kama mee ka OKWUTE ndị na-arụ ụlọ jụrụ ajụ ghọzịa OKWUTE bụ ide buu/ji ụlọ.

Makana agbarụsịa Ngene,ekulukwa Ngene ñụọ. 


© Mazi Damian Okafor 

(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments

Popular posts from this blog

Tomato now produced in large quantity in Igbo land

Beyond Politics Hon Kemkamma Kama has taken OHANIVO to enviable height