Congratulations to Mazi Damian Okafor
https://m.facebook.com/story.php?story_fbid=pfbid02QFZPUGYx8th8rLKBEwhBDRq2CkTJb3cdJiDZ3V9yUz9NGwPAjjnhw1SQdpKcwxyal&id=100061454784308&mibextid=Nif5oz
Asị na Ehi enweghi ỌDỤ na Chi ya na a chụrụ ya Ijiji.
Mana kama Ehi m ga agbanarị m/agbafu egbubie m ya ỌDỤ
Egwu/ụjọ jide Nkịta,ỌDỤ aga ya na ngada.
Mana ọbụkwa na ỌDỤ ka-esi amata ihe na-adị Nkịta mma.
Ikuku bugharịsịa ỌDỤ iguu o zuru ike
Mana Oke agbaghị ọsọ ỌDỤ ere ya ọkụ.
Ọkụkọ anaghị echefu onye foro/horo ya ỌDỤ na udu mmiri.
Mana Ọsa gbajiri ỌDỤ mma ya arụọra.
Ma chetakwa na:Ewu ebere ỌDỤ ejighi ya achụ aja.
ỌFỌ m taata bụ:
Ka CHINEKE gọzie ỌDỤ ahịa anyị nakwa ỌDỤ ihe mmetụaka anyị ka ngọzi ga-esi na ya pụta chọọ ndụ anyị mma etu ỌDỤ Ọsa si achọ Ọsa mma.Ka ọ ga-abụ ahụ anyị bụ ỌDỤM ahụkwa ihe anyị DỤDỤ na ỌDỤ
OKIKE kere ụwa!
Anyị sịrị gị biko mekwa ndụ anyị ka ọ bụrụ:onye emetụ kwana Agụ aka na ỌDỤ ma ọdị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.
Anyị were na ekwezi gị nkwa ekele na ikpọ isiala.
Makana Ọkụkọ anaghị echefu onye foro ya ỌDỤ na udu mmiri.
Ya gazie!
Ndewo!
© Mazi Damian Okafor
(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)
Comments
Post a Comment