Barr. (Mrs) CHIOMA NWEZE is the best for the Job~~Igbo Youths
(BARR (MRS) CHIOMA NWEZE BU AGU NWANYI; ODOGWU NDI IGBO JIRI BIRI)
Asị na ebube AGỤ na eche AGỤ nche
Mana ihe AGỤ ji eme iree dị ya na mbọ.
Kama ọ na-abụkwa ụkwụ jie/gbajie AGỤ, Mgbada abịara ụgwọ.
Ọhịa-ahụrụ AGỤ abụghịkwa obere ọhịa.
Makana AGỤ anaghị akpa na obere ọhịa.
Mana onye gbue AGỤ,agụnye ya na OGBUAGỤ!
Ana ekiri OGBUAGỤ ana ekirikwa AGỤ ogburu.
Ka ejiri nwa Mkpi were ma-atụ,asịghịkwa ka AGỤ gbue nne ya.
Mana AGỤ gwara nwa Ebune na ọgbasịa ọsọ na ya bụ AGỤ ka ga egbu ya.
Nwa AGỤ anaghị eme anya ụra.
AGỤ anaghị eri AGỤ.
Mana AGỤ na egbu AGỤ.
Ụkwara AGỤ ka Enwe ji eteta ụra.
Mana anaghị eji na AGỤ na egbu Enwe were sịzịa na ụdara nwa Enwe bụzị ụdara nwa AGỤ.
Ma chetakwa na:AGỤLỌ/AGỤNO sịrị na AGỤ niile bụ AGỤ na onweghikwa nke bụ obere AGỤ.
Ekpere m taata bụ:
CHINEKE!
Asị na e buru egbe na-achụ AGỤ na ọ na eme ka obi sie ike.
Makana ọ na-abụ ejide ibe ji na-aka abịa saa agụụ okwu.
Biko bunye anyị egbe anyị ga eji achụ AGỤ niile anyị na-achụ ọsọ.
Ọ bụ AGỤ enweghi ọrụ?
Nye anyị ọrụ.
Ọ bụ AGỤ enweghi nwa?
Nye anyị nwa ka ụmụ.
Ụdị AGỤ ọbụna ọ bụ,nye anyị egbe anyị ga eji gbagbu ya.
Anyị sịrị ka ụkwụ jie AGỤ niile anyị na -achụ ọsọ na AGỤ ndị na-achụ anyị ọsọ. Ka anyị bụ "mgbada" were bịara ya ụgwọ.
Anyị sịrị Ewu nweta ite ya tiwa ya na otera mgbe ite jiri mebe isi Ewu ihe.
OKIKE kere ụwa!
Asị na mba ana abara AGỤ bụ na azụ ya.Biko bịa were ngọzi na nchekwa gị gbaa ndụ anyị ogige ka ndụ anyị were bụrụ "onye emetụkwana AGỤ aka na ọdụ ma ọdị ndụ ma ọnwụrụ anwụ"
Ka ndụ anyị were bụrụ azụ anụ ụka nyere ilo na-asị.
Makana ebube AGỤ na eche AGỤ.
© Mazi Damian Okafor
(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments
Post a Comment