Augustine Ekeh; The Man Who Saw Tomorrow


 

(I will be the last person to betray Augustine Ekeh; Dead or Alive; I am with him. He gave the Youths victory over slavery. He is our Hero)


Asị na ana-afụ/egbu ỌJA/OPI mgba na ọnaghị ekwe Ọkamgba/Dimgba o didi.

Makana ọ bụ ỌJA/OPI ka eji agwa mmanwụ okwu ọgba ofeke gharị.

             


ỌJA/OPI onye nwere ka ọna-afụ/egbu.

Mana nwoke,nwanyị na egburu ỌJA/OPI na eji azụ adaba na ụmị.


Nkakwụ sịrị na ọ ka bụ ỌJA/OPI nna ya nwụrụ anwụ fụrụ ka ya ka na-afụ, ụmụ mmadụ na-asị na ọnụ ya toro ogologo.

Ọ bụzị gịnị ka ha ga-ekwu ma ọ malite ị fụụ ỌJA nke ya?


Ma chetakwa na:ndị mmụọ jụụ aja na onweghizi ihe ana-afụ na ỌJA/OPI iji beku/ akpọku ha na ada ụda.


ỌFỌ m taata bụ: 

 CHINEKE! ọ kwa ị hụrụ na ọ bụ etu nwoke, nwanyị na-egburu ỌJA si eji azụ adaba na ụmị ka Naijirịa siri were azụ daaba na ụmị .

Nke meziri na ọbụghịzị ihe ana afụrụ mmanwụ na ỌJA/OPI ka ọna agba na-egwu.

Makana onweghizi ihe anyị bụ ụmụ gị bụ mmanwụ na aghọtazi na OPI Naijirịa na afụ. 


OKIKE kere ụwa!

Etu Nkakwụ siri kwue na ọ ka bụkwa ỌJA nna ya nwụrụ anwụ ka ya ka na afụ; ụmụ mmadụ asị na ọnụ ya toro ogologo.Ọbụzị gịnị ka ha ga ekwu ma ya malite ị fụụ ỌPI/ỌJA nke ya? 


Makana ọ bụ OPI ka eji agwa mmanwụ okwu ọgba ofeke ghara


Ya gazie!

Ndewo!


© Mazi Damian Okafor

(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments

Popular posts from this blog

Ezza is the oldest clan in Igbo Land

Dr GOC and His Love for humanity