Augustine Ekeh; The Man Who Saw Tomorrow


 

(I will be the last person to betray Augustine Ekeh; Dead or Alive; I am with him. He gave the Youths victory over slavery. He is our Hero)


Asị na ana-afụ/egbu ỌJA/OPI mgba na ọnaghị ekwe Ọkamgba/Dimgba o didi.

Makana ọ bụ ỌJA/OPI ka eji agwa mmanwụ okwu ọgba ofeke gharị.

             


ỌJA/OPI onye nwere ka ọna-afụ/egbu.

Mana nwoke,nwanyị na egburu ỌJA/OPI na eji azụ adaba na ụmị.


Nkakwụ sịrị na ọ ka bụ ỌJA/OPI nna ya nwụrụ anwụ fụrụ ka ya ka na-afụ, ụmụ mmadụ na-asị na ọnụ ya toro ogologo.

Ọ bụzị gịnị ka ha ga-ekwu ma ọ malite ị fụụ ỌJA nke ya?


Ma chetakwa na:ndị mmụọ jụụ aja na onweghizi ihe ana-afụ na ỌJA/OPI iji beku/ akpọku ha na ada ụda.


ỌFỌ m taata bụ: 

 CHINEKE! ọ kwa ị hụrụ na ọ bụ etu nwoke, nwanyị na-egburu ỌJA si eji azụ adaba na ụmị ka Naijirịa siri were azụ daaba na ụmị .

Nke meziri na ọbụghịzị ihe ana afụrụ mmanwụ na ỌJA/OPI ka ọna agba na-egwu.

Makana onweghizi ihe anyị bụ ụmụ gị bụ mmanwụ na aghọtazi na OPI Naijirịa na afụ. 


OKIKE kere ụwa!

Etu Nkakwụ siri kwue na ọ ka bụkwa ỌJA nna ya nwụrụ anwụ ka ya ka na afụ; ụmụ mmadụ asị na ọnụ ya toro ogologo.Ọbụzị gịnị ka ha ga ekwu ma ya malite ị fụụ ỌPI/ỌJA nke ya? 


Makana ọ bụ OPI ka eji agwa mmanwụ okwu ọgba ofeke ghara


Ya gazie!

Ndewo!


© Mazi Damian Okafor

(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments

Popular posts from this blog

Dr. GOC and His Love for humanity

Ezza is the oldest clan in Igbo Land

Dr GOC and His Love for humanity