A Greater Ishiagu Kingdom


 

https://m.facebook.com/story.php?story_fbid=pfbid02XqnbJASskV7MirXuxS364g7MHz6p5gCqqhEsCfS9ZUxvjYXeQYXwJD69e15TsEwsl&id=100061454784308&mibextid=Nif5oz


(Arc Ajah Moses; Onyendu Ndi Ishiagu na mba uwa nile bu Nwoke obi Oma)


Asị na ọ bụ nwayọ nwayọ ka eji aracha OFE dị ọkụ.

Makana etere ụgba etere ogiri ihe ama bụ OFE.

Mana OFE dị mma ụtara dị mma,akpịrị ekwebe egwu.

        


Ejighi ọnụ nkịtị etinye azụ na OFE.

Ya mere na onye ejighi ego anaghị eri OFE Owerre

Makana ka ete OFE ka etere ụnyahụ na efu/ewe ihe OFE.


Anaghị achọ isi Ehi achọ na ite OFE.

Onweghi onye ga-asị na OFE nne ya siri adịghị ụtọ.


Aka bitee/jide ụtara egwu atụba OFE

Mana sị wepụ aka Enwe na OFE tupu ọghọrọ aka mmadụ.


Ma chetakwa na OFE nwata tere na-atọ mbụzụ mbụzụ(abụzụ abụzụ)


Ekpere m taata bụ:

CHINEKE!

Biko bịa tere anyị ezigbote OFE eri amicha aka,akwọrọ aka were tee nke ga-abụrụ anyị "OFE aruike,OFE mmepe ụzọ na OFE mbulielu"

Ka ndụ anyị juputa na añụrị ma na ekwe egwu etu akpịrị si ekwe egwu ma OFE na ụtara dị mma.


OKIKE kere ụwa!

Anyị makwana obi anaghị adị ndị iro mma maka ezigbote OFE ị na etere anyị.Makana ọnọdụ Ugo adịghị Egbe mma.

Ya mere ha jikwa etere anyị ajọ OFE.

Mana ha tesịa ya bụ ajọ OFE ha nekwa ya nnu.

Makana nwanyị sisia OFE o detụrụ na ire.Aka nsi na-aja ha jukwa ha ọnụ ooo

© Mazi Damian Okafor

(National Youth Leader Ohanaeze Ndigbo Worldwide)

Comments

Popular posts from this blog

Tomato now produced in large quantity in Igbo land

Beyond Politics Hon Kemkamma Kama has taken OHANIVO to enviable height